6A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu, ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?
7A jụrụ m ịmetụ ya aka, nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.
8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.
9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.
10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.