3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
5Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.