8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
10Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
12Osisi vaịnị anwụọla. Osisi fiig akpọnwụọla. Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla. Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla. Nʼebe ndị mmadụ nọ, ọṅụ alala.