7Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam. O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m, kpofuo ha, hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.
8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya nʼụlọ Onyenwe anyị. Ndị nchụaja na-eru ụjụ, bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
10Emebiela ala ubi niile, ala nọ na-eru ụjụ. Ebibiela ọka niile, mmanya adịghịkwa, otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.
11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi, tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị. Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị, nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.