Juel 2

Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.

Joel 2:14 (UKJV) Who knows if he will return and repent, and leave a blessing behind him; even a food offering and a drink offering unto the LORD your God?

12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”

13Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.

14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.

15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.

16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.