Juel 2

Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

Joel 2:16 (UKJV) Gather the people, sanctify the congregation, assemble the elders, gather the children, and those that suck the breasts: let the bridegroom go out of his chamber, and the bride out of her closet.

14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.

15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.

16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.