Juel 2

Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

Joel 2:17 (UKJV) Let the priests, the ministers of the LORD, weep between the porch and the altar, and let them say, Spare your people, O LORD, and give not yours heritage to reproach, that the heathen should rule over them: wherefore should they say among the people, Where is their God?

15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ.

16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.

17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.

19Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.