Juel 2

Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.

Joel 2:22 (UKJV) Be not afraid, all of you beasts of the field: for the pastures of the wilderness do spring, for the tree bears her fruit, the fig tree and the vine do yield their strength.

20“Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.

21Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.

22Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.

23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.

24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.