Juel 2

Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.

Joel 2:23 (UKJV) Be glad then, all of you children of Zion, and rejoice in the LORD your God: for he has given you the former rain moderately, and he will cause to come down for you the rain, the former rain, and the latter rain in the first month.

21Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya.

22Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.

23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ.

24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.

25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.