2Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa.
3Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
4Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.
5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.