Juel 2

Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.

Joel 2:5 (UKJV) Like the noise of chariots on the tops of mountains shall they leap, like the noise of a flame of fire that devours the stubble, as a strong people set in battle array.

3Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.

4Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha.

5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.

6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.

7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.