16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.
17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ.
18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim.
19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha.
20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile.