28Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
29Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
30na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
31Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
32Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.