1Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”
2Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.
3Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”