Ndị Ikpe 12

Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.

Judges 12:2 (UKJV) And Jephthah said unto them, I and my people were at great strife with the children of Ammon; and when I called you, all of you delivered me not out of their hands.

1Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”

2Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.

3Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”

4Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.