20Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea.
21Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ.
22Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ.
23Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.”
24Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya.