29Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea.
30Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga.
31Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea.
32Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”
33Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.