Ndị Ikpe 20

Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”

Judges 20:32 (UKJV) And the children of Benjamin said, They are smitten down before us, as at the first. But the children of Israel said, Let us flee, and draw them from the city unto the highways.

30Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga.

31Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea.

32Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”

33Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.

34Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.