Ndị Ikpe 20

Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.

Judges 20:33 (UKJV) And all the men of Israel rose up out of their place, and put themselves in array at Baaltamar: and the hidden attackers in wait of Israel came forth out of their places, even out of the meadows of Gibeah.

31Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea.

32Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”

33Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.

34Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.

35Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.