Abụ Akwa 1

Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.

Lamentations 1:2 (UKJV) She weeps sore in the night, and her tears are on her cheeks: among all her lovers she has none to comfort her: all her friends have dealt treacherously with her, they are become her enemies.

1Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu! Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ, bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile. Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị si ghọọ ohu.

2Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.

3Juda ejeela biri nʼala ọzọ, mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. Nʼetiti nhụju anya ya ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.

4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.