2Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.
3Juda ejeela biri nʼala ọzọ, mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. Nʼetiti nhụju anya ya ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.
4Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
5Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
6Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.