52Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
54Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
55Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
56Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”