27Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.”
28Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
29Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona.
30Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a.
31Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a.