Matiu 12

Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”

Matthew 12:21 (UKJV) And in his name shall the Gentiles trust.

19Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.

20Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie.

21Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”

22Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu.

23Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.