Nehemaya 9

“Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.

Nehemiah 9:7 (UKJV) You are the LORD the God, who did choose Abram, and brought him forth out of Ur of the Chaldees, and gave him the name of Abraham;

5Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.

6Gị onwe gị, naanị gị bụ Onyenwe anyị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.

7“Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.

8Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume.

9“Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.