6Gị onwe gị, naanị gị bụ Onyenwe anyị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.
7“Gị, onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham.
8Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume.
9“Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
10I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ.