1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
2“Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
3Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
4“Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
5Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.