3Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
4“Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
5Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
6Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
7“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.