12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.
13Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.