14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
17Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.