10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.