11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.