13Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo, ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
14Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada, ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.