15Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ, ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.
16Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma, ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
17Onye nwere obiọma baara onwe ya uru, ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
18Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ, ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.