4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.