4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.
8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.