2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.
4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.
5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.
6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.