16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
19Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.