18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
19Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.