10Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
11nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
12Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
13Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.