11nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
12Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
13Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.
15Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.