25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.
26Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.
27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
28Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?
29Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”