Ilu 24

Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”

Proverbs 24:29 (UKJV) Say not, I will do so to him as he has done to me: I will render to the man according to his work.

27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.

28Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu. Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?

29Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m. Aga m akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere.”

30Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee, bụ ubi vaịnị nke onye na-enweghị uche,

31hụ na ogwu etochiela ya, ahịhịa etochiekwala ya; mgbidi dị ya gburugburu adaakwala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.