Ilu 25

Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.

Proverbs 25:18 (UKJV) A man that bears false witness against his neighbour is a maul, and a sword, and a sharp arrow.

16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.

17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.

18Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.

19Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.

20Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.