1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.