3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị, ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
6Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije, otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.