9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.