11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
14Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
15Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa, ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.