4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.
6Ọ bụ onye ajọ omume siri ọnya ka ọnya ahụ na-ama. Ma ndị ezi omume na-anọrọ onwe ha na-agụ egwu ọṅụ.
7Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.
8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.