1Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
2Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
3Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
4Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?